Psalms 74

Abụ maskil nke Asaf.

Ekpere maka enyemaka

1Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?
Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
2Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie,
ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara,
nʼugwu Zayọn ebe i biri.
3Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a.
Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.

4Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị.
Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
5Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike
ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
6Ha ji anyụike na egbugbu ha
kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
7Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa.
Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
8Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!”
Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.

9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke.
Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ.
Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị?
Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị?
Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!

12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie.
Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.

13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ.
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
14Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan,
mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
15Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ.
I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
16Ehihie na abalị bụ nke gị.
I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
17Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa.
Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.

18O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị,
na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
19Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka.
Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
20Chetakwa ọgbụgba ndụ gị,
nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
21Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere;
ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
22O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe.
Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
23Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya,
olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.
Copyright information for IboBIU